Numbers 18:1-6

Ọrụ ndị nchụaja na ndị Livayị

1 Onyenwe anyị gwara Erọn sị, “Gị, na ụmụ gị ndị ikom gị, na ezinaụlọ nna gị ga-ebu ahụhụ ajọ omume metụtara ebe nsọ ahụ. Gị na ụmụ gị ndị ikom naanị ka ọ dị nʼaka ịsa ajụjụ ihe ọjọọ ọbụla banyere ọrụ nchụaja. 2Site nʼebo unu kpọbata ụmụnna gị ndị Livayị ka ha sonyere gị ma nyere gị aka mgbe gị na ụmụ gị ndị ikom na-eje ozi nʼụlọ nzute Ihe Ama. 3Ha ga-anọ gị nʼokpuru ije ozi niile nʼụlọ nzute, ma ha agaghị abịaru nso ngwongwo e ji chọọ ebe nsọ ahụ mma, maọbụ nʼebe ịchụ aja. Ma ọ bụghị otu a, gị na ha ga-anwụ. 4Ha ka ọ dịrị, isonye gị nʼilekọta ụlọ ikwu ahụ, ya bụ, ihe niile metụtara ụlọ ikwu anya. O nweghị onye ọzọ nke ga-abịa nso ebe ị nọ.

5“Gị ka ọ dịrị ilekọta ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ, na ebe ịchụ aja ahụ, ka oke iwe Onyenwe anyị ghara ịdakwasị onye ọbụla nʼala Izrel ọzọ. 6Mụ onwe m ahọpụtala ụmụnna gị ndị Livayị site nʼetiti ndị Izrel, were ha nye gị dịka onyinye, ka ha bụrụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị maka ịrụ ọrụ ụlọ nzute.
Copyright information for IboBIU